40Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị, dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,
41mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma, mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe, aga m abọ ọbọ megide ndị iro, kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị.
42Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.”
43Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.
44Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.