Diuteronomi 4

E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.

Deuteronomy 4:14 (UKJV) And the LORD commanded me at that time to teach you statutes and judgments, that all of you might do them in the land where all of you go over to possess it.

12Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu.

13O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.

14E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.

15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya

16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.