Diuteronomi 4

Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya

Deuteronomy 4:15 (UKJV) Take all of you therefore good heed unto yourselves; for all of you saw no manner of embodiment on the day that the LORD spoke unto you in Horeb out of the midst of the fire:

13O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.

14E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.

15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya

16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

17maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.