Diuteronomi 4

maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,

Deuteronomy 4:17 (UKJV) The likeness of any beast that is on the earth, the likeness of any winged fowl that flies in the air,

15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya

16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

17maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,

18maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.

19Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.