Diuteronomi 4

maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.

Deuteronomy 4:18 (UKJV) The likeness of any thing that creeps on the ground, the likeness of any fish that is in the waters beneath the earth:

16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

17maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,

18maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.

19Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.

20Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.