43Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.
44Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel.
45Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta
46na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta.
47Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.