Diuteronomi 5

ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike.

Deuteronomy 5:14 (UKJV) But the seventh day is the sabbath of the LORD your God: in it you shall not do any work, you, nor your son, nor your daughter, nor your manservant, nor your maidservant, nor yours ox, nor yours ass, nor any of your cattle, nor your stranger that is within your gates; that your manservant and your maidservant may rest as well as you.

12Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.

13Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile,

14ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike.

15Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ.

16Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.