Diuteronomi 5

Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ.

Deuteronomy 5:26 (UKJV) For who is there of all flesh, that has heard the voice of the living God speaking out of the midst of the fire, as we have, and lived?

24Unu sịrị, “Onyenwe anyị bụ Chineke anyị egosila anyị ebube ya, na ịdị ukwu ya, anyị anụkwala olu ya site nʼime ọkụ ahụ. Taa anyị ahụla na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ọbụladị ma Chineke kpanyere ha ụka.

25Ma ugbu a nʼihi gịnị ka anyị ga-eji nwụọ? Ọkụ a, nke na-enwusi ike ga-erechapụ anyị. Anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na anyị anụ olu Onyenwe anyị Chineke anyị gaa nʼihu.

26Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ.

27Gaa nso nụtara anyị ihe Onyenwe anyị Chineke anyị na-ekwu, mgbe ahụ, gwa anyị ihe ọbụla bụ nke ọ gwara gị, anyị ga-anụ, mekwa ya.”

28Onyenwe anyị nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, Onyenwe anyị sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.