Diuteronomi 5

Onyenwe anyị nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, Onyenwe anyị sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi.

Deuteronomy 5:28 (UKJV) And the LORD heard the voice of your words, when all of you spoke unto me; and the LORD said unto me, I have heard the voice of the words of this people, which they have spoken unto you: they have well said all that they have spoken.

26Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ.

27Gaa nso nụtara anyị ihe Onyenwe anyị Chineke anyị na-ekwu, mgbe ahụ, gwa anyị ihe ọbụla bụ nke ọ gwara gị, anyị ga-anụ, mekwa ya.”

28Onyenwe anyị nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, Onyenwe anyị sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi.

29Lee, ọ ga-adị nnọọ mma ma mkpụrụobi ha dị otu a, ịtụ egwu m, na idebe ihe niile m nyere ha nʼiwu, ka ihe gaara ha na ụmụ ha nke ọma mgbe niile ebighị ebi.

30“Gaa, gwa ha ka ha laghachi nʼụlọ ikwu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.