Diuteronomi 6

Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.

Deuteronomy 6:18 (UKJV) And you shall do that which is right and good in the sight of the LORD: that it may be well with you, and that you may go in and possess the good land which the LORD swore unto your fathers.

16Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.

17Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.

18Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.

19Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.

20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.