Diuteronomi 6

Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”

Deuteronomy 6:20 (UKJV) And when your son asks you in time to come, saying, What mean the testimonies, and the statutes, and the judgments, which the LORD our God has commanded you?

18Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.

19Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.

20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”

21Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.

22Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.