23Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
24Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.
25Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”