Diuteronomi 7

Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;

Deuteronomy 7:1 (UKJV) When the LORD your God shall bring you into the land where you go to possess it, and has cast out many nations before you, the Hittites, and the Girgashites, and the Amorites, and the Canaanites, and the Perizzites, and the Hivites, and the Jebusites, seven nations greater and mightier than you;

1Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;

2mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.

3Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.