Diuteronomi 6

Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.

Deuteronomy 6:8 (UKJV) And you shall bind them for a sign upon yours hand, and they shall be as frontlets between yours eyes.

6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.

7Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.

8Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.

9Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.

10Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.