Diuteronomi 6

Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,

Deuteronomy 6:10 (UKJV) And it shall be, when the LORD your God shall have brought you into the land which he swore unto your fathers, to Abraham, to Isaac, and to Jacob, to give you great and goodly cities, which you builded not,

8Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.

9Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.

10Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,

11na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,

12leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.