Diuteronomi 7

Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.

Deuteronomy 7:13 (UKJV) And he will love you, and bless you, and multiply you: he will also bless the fruit of your womb, and the fruit of your land, your corn, and your wine, and yours oil, the increase of your cattle, and the flocks of your sheep, in the land which he swore unto your fathers to give you.

11Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa.

12Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.

13Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.

14A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.

15Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.