Diuteronomi 7

Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.

Deuteronomy 7:16 (UKJV) And you shall consume all the people which the LORD your God shall deliver you; yours eye shall have no pity upon them: neither shall you serve their gods; for that will be a snare unto you.

14A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.

15Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!

16Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.

17Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?”

18Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.