Diuteronomi 7

Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.

Deuteronomy 7:22 (UKJV) And the LORD your God will put out those nations before you by little and little: you may not consume them at once, lest the beasts of the field increase upon you.

20Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.

21Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.

22Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.

23Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.

24Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.