Diuteronomi 7

Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.

Deuteronomy 7:20 (UKJV) Moreover the LORD your God will send the hornet among them, until they that are left, and hide themselves from you, be destroyed.

18Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.

19Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.

20Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.

21Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.

22Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.