24Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.
25Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
26Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.