Diuteronomi 7

Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.

Deuteronomy 7:5 (UKJV) But thus shall all of you deal with them; all of you shall destroy their altars, and break down their images, and cut down their groves, and burn their graven images with fire.

3Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.

4Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.

5Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.

6Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.

7Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.