Diuteronomi 7

Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.

Deuteronomy 7:4 (UKJV) For they will turn away your son from following me, that they may serve other gods: so will the anger of the LORD be kindled against you, and destroy you suddenly.

2mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.

3Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.

4Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.

5Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.

6Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.