Diuteronomi 9

Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.

Deuteronomy 9:1 (UKJV) Hear, O Israel: You are to pass over Jordan this day, to go in to possess nations greater and mightier than yourself, cities great and fenced up to heaven,

1Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.

2Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?”

3Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.