Diuteronomi 9

Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.

Deuteronomy 9:11 (UKJV) And it came to pass at the end of forty days and forty nights, that the LORD gave me the two tables of stone, even the tables of the covenant.

9Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ.

10Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.

11Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.

12Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”

13Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.