11Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.
12Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”
13Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.
14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
15Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.