13Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.
14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
15Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.
16Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.
17Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.