16Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.
17Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.
18Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.
19Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.
20Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.