26Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.
27Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.
28Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’
29Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”