27Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.
28Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’
29Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”