Diuteronomi 10

Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi.

Deuteronomy 10:1 (UKJV) At that time the LORD said unto me, Hew you two tables of stone like unto the first, and come up unto me into the mount, and make you an ark of wood.

1Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi.

2Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.”

3Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.