Diuteronomi 9

Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.

Deuteronomy 9:6 (UKJV) Understand therefore, that the LORD your God gives you not this good land to possess it for your righteousness; for you are a stubborn people.

4Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.

5Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.

6Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.

7Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.

8Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.