12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.
14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?
15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike, ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.
16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.