10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.
11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.
12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.
14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?