Ekiliziastis 10

Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.

Ecclesiastes 10:2 (UKJV) A wise man's heart is at his right hand; but a fool's heart at his left.

1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.

2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.

3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.

4Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.