1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.
2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.
3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.