5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.
6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.
7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.
8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.
9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.