6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.
7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.
8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.
9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.
10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.