1Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
2Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.
3Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.