3Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.
6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
7Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.