7Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.
8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
9Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.
10Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.