12Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.
13Ugbu a anụla ihe ndị a niile, ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.
14Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.