Ekiliziastis 12

mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.

Ecclesiastes 12:5 (UKJV) Also when they shall be afraid of that which is high, and fears shall be in the way, and the almond tree shall flourish, and the grasshopper shall be a burden, and desire shall fail: because man goes to his eternal home, and the mourners go about the streets:

3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,

4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala,

5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.

6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ, tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo, tupu ite adawaa nʼisi iyi, tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.

7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta; mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.