1Ya mere, cheta Onye kere gị mgbe ị ka bụ okorobịa, tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa, na mgbe afọ aka abịarubeghị mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”
2Tupu anyanwụ na ìhè, ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị, na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.
3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,
4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala,
5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu; na ihe egwu nke okporoụzọ, mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ, agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.