1Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu.
2“Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?”
3Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.