Ekiliziastis 2

Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?

Ecclesiastes 2:25 (UKJV) For who can eat, or who else can hasten hereunto, more than I?

23Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.

24Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.

25Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?

26Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.