21Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
22Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
23Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.
24Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.
25Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?