19Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
20Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
21Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
22Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
23Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.