5Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha,
6wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
7Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.
8Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.
9E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.