Ekiliziastis 2

Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.

Ecclesiastes 2:8 (UKJV) I gathered me also silver and gold, and the exclusive treasure of kings and of the provinces: I got me men singers and women singers, and the delights of the sons of men, as musical instruments, and that of all sorts.

6wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.

7Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.

8Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.

9E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.

10Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere; egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla. Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile, nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.