Ekiliziastis 3

Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.

Ecclesiastes 3:12 (UKJV) I know that there is no good in them, but for a man to rejoice, and to do good in his life.

10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.

11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.

12Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.

13Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.

14Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.